Skip Navigation
The Endowment for Human Development
The Endowment for Human Development
Improving lifelong health one pregnancy at a time.
Donate Now Get Free Videos

Multilingual Illustrated DVD [Tutorial]

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


National Geographic Society This program is distributed in the U.S. and Canada by National Geographic and EHD. [learn more]

Choose Language:
Download English PDF  Download Spanish PDF  Download French PDF  What is PDF?
 

Chapter 43   6 to 7 Months (24 to 28 Weeks): Blink-Startle; Pupils Respond to Light; Smell and Taste

N’izu iri abụọ na anọ, elu anya emepekwa ọzọ nwa ebu n’afọ na-eziko mmeghari ntabi anya nke n’eyi gi eyi. Mmeghari a n’ebe uda ike nọ na-etoputakari n’oge n’ebe nwa ebu n’afọ nke nwanyi nọ.

Ọtụtụ ndị nchọputa kowara na mkpughe n’ebe oke uda nọ nwere ike imetuta ahuike nke nwa ebu n’afọ. Nsogbu nwere ike ịpụta gunyere mgbati ubara nke ọnọdụ mkpụrụobi, nwa ebu n’afọ ilo ihe karia ka atụrụ anya ya na mgbawe agwa n’eyi eyi. Ụfọdụ nsogbu mwere ike idaputa ma emechaa gunyere na nwa agaghi anụzikwa ihe.

Okuku ume nwa ebu n’afọ nwere ike ịla elu nke ukwu ihe dika nkuru ume na nkụpụta ugboro iri anọ n’anọ dị n’otu nkeji.

N’oge ọnwa atọ nke ikpe azụ n’afọime, otito osisọ nke ụbụrụ na-eburu umele ihe kariri pasenti iri ise nwa ebu n’afọ kuuru. Arụ uburu na-abawanye ruo ihe dị ka pasentị narị anọ ma ọ bụ narị ise.

N’izu iri abụọ na isii mkpụrụ anya ebido gbapụtawa anya mmiri.

Ọdụanya na - emegharị n’oge ebe ihe dị n’ihe dị ka izu iri abụọ na asaa. Mmeghari a na – echekota oke ihe n’erute n’oduanya na ndụ niile onyeahụ.

Ihe niile a chọrọ iji nụ isi nke ọbụla amalitele rụwa ọrụ. Ọmụmụ gbasara ụmụaka akachaghị aka gbara ama ikikere iji chopụta isi n’oge dị ka izu iri abụọ na isii mgbe njiko spam nke nwoke na akwa nwanyi gachara.

Idote ihe dị ụtọ n’ime mmiri ọmụmụ na-ebulite ugboro ole nwa ebu n’afọ na-elo ihe. N’idi iche, e nwere mgbada n’usoro nwa ebu n’afọ si elo ihe sotere iwebata ihe na-elu ilu. Mgbanwe ozi dị n’iru kwa mgbe kwa mgbe na-esotekwa.

Site usoro ntụpụ ụkwụ yiri agam ije, nwa ebu n’afọ atugharịwa.

Nwa ebu n’afọ adighịzịkwa ka ọhikọrọ ahịko etu ọdị mbụ ka abụba ndị ọzọ na-apụta n’okpuru anụahụ. Abụba na arụ orụ di mkpa n’ikwagide udịdị ahụ na-edọbakwa umele mgbe amuchara nwa.

Chapter 44   7 to 8 Months (28 to 32 Weeks): Sound Discrimination, Behavioral States

N’izu iri abụọ na asaa nwa ebu n’afọ nwere ike imata ihe dị iche di n’uda dị elu na nke dị ala.

N’izu iri atọ, a na ahụkarị mmeghari iku ume ugbua ọ nakwa eziko site n’oge na pasentị iri ato ruo iri anọ n’ebe nwa ebu n’afọ nọ.

Mgbe oruru n’onwa anọ nke ikpeazụ n’afọ ime, nwa ebu n’afọ na-egosiputa usoro ọrụ ejikwatara nke ọma a nwekwa mgbe ezum ike. Usoro omume ndia n’egosiputa mbawanye ihe ga-ebute nsogbu nke sentral nevọs sistem.

Chapter 45   8 to 9 Months (32 to 36 Weeks): Alveoli Formation, Firm Grasp, Taste Preferences

Na nhatanha izu iri atọ na abụọ, ezigbo nkọlọ, ma ọ bụ sel akpa ume, amalite itolite na ngụgụ. Ha ga na-etolite tutu ruo afọ asatọ amụchara nwa.

N’izu iri atọ na ise nwa ebu n’afọ amarala ejidesi ihe aka ike.

Mkpughe nwa ebu n’afọ n’ebe ihe dị iche dị dika ọ na-emetụtụ ụdị ụtọ nwa n’achokarị ma amucha ya. Ima atụ, ụmụaka ebu n’afọ ndị nne ha riri anaisi, ihe na-enye likoraịsị ụtọ ya, gosiri nnabata anaisi mgbe amuchara ha. Ụmụaka amụrụ ohụrụ ndi eweghi mkpugbe mgbe ya nọ n’afọ kpọrọ anaisi asị.

Chapter 46   9 Months to Birth (36 Weeks through Birth)

Nwa ebu n’afọ na-amalite njem ime omume site n’inuputa homonụ nke ana-akpọ estrojin nke ukwu nke a na-amalite ntughari site na nwa ebu n’afọ buruzie nwa amụrụ ọhụrụ.

Ihe ejiri mara ime omume bụ mbili elu na mgbadata sirike nke akpanwa, nke ga-abụzị ọmụmụ nwa.

Site na njikọ spam nwoke na akwa nwanyi ruo n’ọmụmụ nwa ma ọ bụ karia oge ahụ, otito mmadụ na-agbanwe agbanwe na-agakwa n’ihu ma dikwa mgbagwojuanya. Ihe nchọpụta ohụụ gbasara usoro a togburu onwe ya. gosiri mmetụta dị mkpa na n’otito nwa ebu n’afọ na ahụike nke ndụ.

Dika nghota anyi n’ihe gbasara mmalite otito mmadụ na abawanye, otu a ka ikikere anyi ikwalite ahụike na-abawanyekwa ma mgbe adị ime ma mgbe amụrụ nwa.


Add a Comment

Your Name: Log In 3rd-party login: Facebook     Google     Yahoo

Comment:
     


Newest  |  Top Rated

5 Comments


wycliffe mabiria
March 12, 2013 at 2:51 am
wycliffe mabiria
You get my manifold congrats. Great resource.
Report
Dislike
Like

kathrin34
May 4, 2012 at 12:18 pm
kathrin34
One of the best sites for pre-birth informations
Report
Dislike
Like

Ramesh P
July 18, 2011 at 9:29 pm
Ramesh P
Very Usefull information.....tahnks a lott.
Report
Dislike
Like
+2 thumbs up

Shukhrat Sattorov
February 22, 2011 at 5:39 am
Shukhrat Sattorov
Thank you for information from my family and from my son who is coming to the world in the summer! It will help us to make a beautiful family!
Report
Dislike
Like
+2 thumbs up

Sofi Katsi
October 4, 2010 at 11:26 am
Sofi Katsi
gravidanza.........la auguro a tutte le donne..
Report
Dislike
Like
+1 thumbs up