Skip Navigation
The Endowment for Human Development
The Endowment for Human Development
Improving lifelong health one pregnancy at a time.
Donate Now Get Free Videos

Multilingual Illustrated DVD [Tutorial]

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


National Geographic Society This program is distributed in the U.S. and Canada by National Geographic and EHD. [learn more]

Choose Language:
Download English PDF  Download Spanish PDF  Download French PDF  What is PDF?
 

The 8-Week Embryo

Chapter 30   8 Weeks: Brain Development

N’izu asatọ ụbụrụ etochaala nke ọma ma werekwa ihe dịka okara n’ibu embrayo buru.

Otito na-agi n’ihu n’ụzọ dị nke ukwu.

Chapter 31   Right- and Left-Handedness

N’izu asatọ, ihe dịka pasentị ruru iri asaa na ise n’ime embrayo na-ezipụta ọmụme akanri ha karia. Nke fọdụrụnụ ekee ya ụhamụha n’ime ndị na-eme aka ekpe na ndi nere ike ime aka abụọ hau. Nke a bụ ihe mbụ na-egosipụta omume akanri ma ọ bụ aka ekpe.

Chapter 32   Rolling Over

Akwụkwọ na-akowa ihe gbasara ụmụaka kowana ikikere ntụghari ka nke na-aputa ihie site n’izu iri ruo n’izu iri abụọ mgbe amuchara nwa. Ka osila dị, ndikota dị mma otu a ka egosiputara n’isi mbụ n’ọnọdụ nwatakiri n’ime akpa mmiri ọmụmụ. Naanị ike achọrọ enweghi nke eji emeri ikikere kariri nke dị na mpụta akpanwa na-egbochi ụmụaka amụrụ ohụrụ ịtụghari atụgharị.

Embrayo na-agbasiwanyega ike n’oge dị otua.

Usoro mmeghari nwere ike idi nwayọ ma ọ bụ dị ọsọ ọsọ, otu ma ọ bụ ugboro ugboro, n’amaghi ama ma ọ bụ amara ama.

Ntụghari isi, nseti olu na mmetụta aka ruo n’ihu na-abiawanye ugboro ugboro.

Imetụta embrayo aka na-eme ka enwee anya uhie, mmeghari agba, ikikere iji ihe, na ntụpụta mkpụrụ ukwu.

Chapter 33   Eyelid Fusion

N’etiti izu nke asaa na izu nke asatọ, nkuanya nke elu na nke ala n’ etochipụ ọsọ ọsọ n’elu anya ma mee ka ha atagidere ofu ebe.

Chapter 34   "Breathing" Motion and Urination

N’agbanyeghi n’ikuku adịghị n’ime akpanwa, embrayo na-ezuko okuku ume kwa mgbe kwa mgbe n’ime izu asatọ.

N’oge a akịrị emeputawago mmamịrị nke o na eziga n’ime akpa mmiri ọmụmụ.

Na embrayo nke ndị nwoke, mkpụrụ amụ na-akpụpụta akpụpụta amalitere imepụta na iziputakwa testoserọnu (ya bụ homonu nke nwoke).

Chapter 35   The Limbs and Skin

Ọkpụkpụ, njikọ, akwara ike, ụmụ irighiri akwara, na oghere ọbara nke aka n’ụkwụ e were nwayọ na-eyitekwa nke ndị okenye.

N’izu asatọ akpụkpọ anụahụ dị mpụta, aburuzie ngidingi akpụkpọ, tufuchaa nnabata ihie ya.

Agbaanya etolite mgbe aji bidoro putaba n’ọnụ ya.

Chapter 36   Summary of the First 8 Weeks

Izu asatọ a bụrula ngwụcha nke okpụkpụ nwa.

N’oge di otu a, embrayo etole site na sel nge ruo n’ihe ruru sel otu njeri nke ga-akpụpụta akụkụ ahụ mmadụ ihe karịrị puku anọ.

Ugbua embrayo nweziri ihe kariri pasentị iri itoolu n’ime ihe ana-ahụ n’ahụ nke ndi okenye.


Add a Comment

Your Name: Log In 3rd-party login: Facebook     Google     Yahoo

Comment: